A naghị enyocha yaỤdị a na-enyochaghị (NE) bụ nke e kewara n'okpuru IUCN Ndepụta uhie nke ụdị ndị na eyi egwu dịka International Union for Conservation of Nature enyochabeghị ya.[1][2] Ụdị nchedo a bụ otu n'ime ụdị nyocha egwu IUCN itoolu maka ụdị iji gosipụta ihe ize ndụ ha nke mkpochapụ ụwa. Ụdị ndị a sitere na 'extinct' (EX) n'otu nsọtụ nke spectrum, na 'ihe na adịchaghị echegbu onwe' (LC) na nke ọzọ. Ụdị 'enweghị data' na 'enweghị nyocha' (NE) adịghị na ụdịdị dị iche iche, n'ihi na ha na egosi ụdị ndị a na enyochabeghị nke ọma iji nye otu ụdị.[3] Ụdị nke 'a na enyochaghị' anaghị egosi na ụdị anaghị anọ n'ihe ize ndụ nke mkpochapụ, kama ọ bụ naanị na a mụọbeghị ụdị ahụ maka ihe ize ndụ ọ bụla a ga akọwa ma bipụta ya. IUCN na adụ ọdụ na ụdị ndị a na ahazi dị ka 'ndị a na enyochaghị' "... ekwesighi imeso ha dịka a ga asị na ha anaghị eyi egwu. O nwere ike ịbụ ihe kwesịrị ekwesị ... inye ha otu nlebara anya dị ka taxa ndị a na eyi egwu, ọ dịkarịa ala ruo mgbe enwere ike nyochaa ọnọdụ ha. " - 7 : 76[3][4] Ka ọ na erule n'afọ 2015, IUCN enyochaala ma kenye ọnọdụ nchekwa ihe karịrị ụdị 76,000 n'ụwa niile. Site na ndị a, ọ kewara ihe dị ka ụdị 24,000 dị ka ndị na eyi egwu n'ụwa niile n'otu ọkwa nchekwa ma ọ bụ ọzọ. Otú ọ dị, n'agbanyeghị atụmatụ dịgasị iche iche banyere ọnụ ọgụgụ nke ụdị dị n'ụwa (site na nde 3 ruo nde 30), nke a pụtara na ụdị IUCN 'a na enyochaghị' (NE) bụ nke kachasị n'ime ụdị ihe ize ndụ itoolu niile.[5] Ihe ndị ọzọ a na eji eme iheA na-etinye usoro nyocha na nkewa nke IUCN zuru ụwa ọnụ na mba na mgbe ụfọdụ na mpaghara dị ka ihe ndabere maka ịtụle egwu nchedo na maka ịmepụta ndepụta Data uhie maka mpaghara ndị ahụ.[6][7][8][9][10][11] A maliteghachila itinye ụkpụrụ nyocha dị ka ụzọ isi kewaa ihe egwu na gburugburu ebe obibi, na gburugburu ebe dị ndụ ọ bụla na-adaba n'ụdị IUCN 'a naghị atụle' tupu mmalite nke usoro nyocha.[12] Hụkwa
Ihe edeturu na ntụaka
|