Samuel A. CounteeSamuel A Countee
Samuel A. Countee (ubochí mbú n'ọnwa Eprel, 1909 rụo ụbọchị irí na otu n'ọnwa Septemba, 1959) bụ ónyé na-ese ihe na ónyé na-akpụ ihe.[1][2][1] A na-akpọ SSG Samuel A. Countee Hall na Fort Leonard Wood iji sọpụrụ ya.[3] Mbido ndụ na agụmakwụkwọA mụrụ Countee na Marshall, Texas na Thomas Countee Na Nannie Salina Yates Countee. Ọ gàrà Booker T. Washington High School site na 1924 rụo 1928.[1] Countee gụsịrị akwụkwọ na 1934 na nzèrè na nka na Bishop College. Mgbè ọ nọ na kọleji, o sere foto nke ngalaba na ndị nchịkwa iji nweta ego màkà agụmakwụkwọ.[1] Countee gụsịrị akwụkwọ na kọleji na 1934 mgbè nke ahụ gasịrị ọ nwetara agụmakwụkwọ na Boston Museum of Arts ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka ónyé na-ese ihe.[1] ỌrụỌrụ Countee gosipụtara ndụ ndị Africa America. Site na 1933-1935, Countee gosipụtara nka ya n'ọtụtụ ihe ngosi. N'afọ 1933, William E. Harmon Foundation gosipụtara ihe osise ya, Little Brown Boy.[1][4] O gosikwara na Mahadum Howard, Mahadum Atlanta, Smith College, Institute of Modern Art na Boston, nà 1936 Texas Centennial's Hall of Negro Life.[1][5] E debara áhà Countee na ndị agha United States na 1942 ebe ọ rụrụ ọrụ na 436th Engineer General Service Dump Truck Company. Mgbè ọ nọ n'usuu ndị agha, e nyèrè y'à ọrụ ịmepụta mural màkà African-American Officers Club na Fort Leonard Wood na Missouri.[1][2][3][6] Ọ na-ese ihe màkà ihe ngosi USO.[2] Countee kwagara New York ka ahapụchara ya na ndị agha. Ọ bịara màrà n'etiti ndị na-ese ihe na New York wee gaa n'ihu na-ese fotoLucille Armstrong, Harry Belafonte, nà Marian Anderson.[2] Ndụ onwe onyeCountee biri na Long Island, New York. Ọ lụrụ Mary Miner na 1955.[1] Countee nwụrụ n'ọrịa kansa n'ubochí irí na otu n'ọnwa Septemba,1959.[1] Ihe NketaN'afọ 2019, a gbanwere aha Fort Leonard Wood African-American Officersī Club nke nwere mgbidi Countee SSG Samuel A. Countee Hall.[2][3] Nwa nwanne Countee, Sammie Witing-Ellis, nyere aka ịkọwa ihe osise ahụ site n'aka nwanne nna ya mgbe ọ chọtara ọrụ kwekọrọ na ya na sketchbook.[3] Ihe odide
Njikọ mpụga |