Sylvester A. MensahSylvester A. Mensah
Sylvester A. Mensah bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ghana, onye edemede, onye nkuzi, ọkachamara na-ahụ maka ego na onye na-ahụ Maka mkpuchi ahụike.[1] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye omeiwu maka mpaghara Dade-Kotopon na Ghana. Mbido ndụ na agụmakwụkwọA mụrụ Mensah na Ghana ma zụlite ya gburugburu ụwa.[2] Ọ gụrụ akwụkwọ dị elu na Mahadum Ghana ebe ọ nwetara nzere bachelọ nke sayensị na Masters na Business Administration (MBA) na Finance na Administration n'ụzọ nkwanye ùgwù. ỌrụMensah bụ onye edemede (onye edemede), ọkachamara ego na Technocrat mkpuchi ahụike.[3] Ọ bụkwa onye nkuzi dị elu na Mahadum nke Ọmụmụ Ọkachamara, Accra Ghana. Ọ bụbu onye isi nchịkwa nke National Health Insurance Authority.[4][5][6][7] ndọrọ ndọrọ ọchịchịMensah bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke National Democratic Congress . Ọ ghọrọ onye omeiwu maka Dade-Kotopon Constituency mgbe ọ gbasịrị asọmpi na ntuli aka ndị omeiwu Ghana na 1996, nke o ji 36,959 merie na-eme 41.50% nke ngụkọta vootu ziri ezi.[8] Nke a bụ megide ndị na-emegide ya; Cecilia Eguakun nke New Patriotic Party onye nwetara 30,484 na-anọchite anya 34.30% nke ngụkọta vootu ziri ezi, Mensa Mac Granaky Quaye onye Independent Candidate onye nwetakwara 3,919 nke na-anọchitere 4.40% nke ngụcha vootu ziri ewu, Christian Randolph Lartey nke People's National Convention onye nwetara 1,703 nke na- nnọchite anya 1.90% nke ngụka vootu niile e nyere na Ivorina Green Kobstreet nke Convention enweghị vootu.[9] N'afọ 2019 ọ bụ onye na-achọ ka ọ bụrụ Flagbearer nke National Democratic Congress mana John Dramani Mahama meriri ya.[10][11] Ihe odide
|